Wednesday 16 January 2019

Ile ọmụgwọ (Maternity Visitation)

Ile ọmụgwọ na omenala Igbo bụ oge nne na abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya).
Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abịa nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ.
Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya. Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ. Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya.




IHE NNE NA-EME N'ỌMỤGWỌ
1. Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma.
2. Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma.
3. Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n'afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki).
4. Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ.
5. Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n'ahụ ọfụma.
6. Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n'elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje,nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta
7. Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime.
8. Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n'ọnọdụ ahụ mbụ.
9. Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n'ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri.

URU ỌMỤGWỌ BARA
Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa.
Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ.

NRI EKWESỊRỊ IRI N'ỌMỤGWỌ
Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche.
1. Ofe mmiri ụda
2. Ji mmiri ọkụ
3. Ofe nsala
4. Mmiri ọgwụ etere ete
5. Tii dị ọkụ na akamụ
6. Nri asụrụ asụ
7. Nzu
8. Azụ ọkpọọ na okporoko
9. Anụ ọkụkọ
10. Ụda
11. Ehuru na ehu
12. Ụzịza
13. Ụtazị
14. Nri ọbụla ga-enwe ezigbote ose
NRI NWAANYỊ EKWESỊGHỊ IRI N'ỌMỤGWỌ
1. Ihe juru oke oyi
2. Egwusi, ọgbọnọ na ofe ọbụla eji mmanụ esi
3. Ahuekere
4. Nri ọbụla nwere abụba (nwaanyị anaghị eri ya maka na a na-ewe ya na abụba ga-akpụkọ ya n'afọ maọbụ n'ahụ).

NGWỤCHA ỌMỤGWỌ
Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu. Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie. A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi.
Nye aka ka ndị enyi gị malụ maka ọgbakọ a sitere n'ịkpọbata ha ka ha wee soro gị mụta ihe.
NDEWO NỤ

Source:  Prince Martin Uchechukwu on Facebook.

0 comments:

Post a Comment