Thursday 15 November 2018

Omenala Igbo (Igbo Tradition) - Article by Prince Martin Uchechukwu

Omenala Igbo bụ asụsụ Igbo, efe/akwa Igbo, ma nke a na-awa awa ma nke a na-ama ama n’ukwu, okpu anyị na-eko n’isi, mkpara anyị na-eji n’aka, ọla anyị na-agba n’aka ma ọ bụ n’ụkwụ, ihe ọlụ anyị na-anya n’olu, akpụkpọ ụkwụo anyị na-agba n’ụkwụ ma ọ bụ ụkwụ nkịtị anyị na-agba. Ihe ndi a bụ omenala Igbo.

Ihe oriri Igbo na-eri bụkwa omenala Igbo: ụkwa, akị, akpụ, garị, ụtara, azụ ndụ, azụ ọkpọ, sungu, okporoko, ayịya, mangala, anụ ewu, anụ nchị, ọkụkọ Igbo na ọkụkọ agịrịkọlchọ, anụ nama, anụ ele, anụ awala, anụ ọgazị, akwa ọgazị na akwa ọkụkọ, kanda, isi ewu ngwọngwọ pepesupu, ofe olugbu, ofe ụgụ, ofe ọhara, ofe nsara, ofe ọkwụrụ, aṅara, ọjị, ose ọjị, ube, ọpọpọ, akị, akwụ, ụdara, kashu, mmịmị, ụkpaka/ụgba, achịkwụagba, bụ omenala Igbo.


Ọfọ na ogu bụ ekpere anyị na Chineke Igbo ji ekwurịkọta okwu, ma ndị nna nna anyị ha ma ndị nne nne anyị ha bụ ndị anyị na-agọ ọfọ ka ha were ọfọ anyị che Chukwu ụmụ Igbo n’ihu kwa ụbọchị nile. Ihe nile Igbo na-atụ n’aka na nke ha na-ese na akwụkwọ, na nke ha na-akpụ dị ka ụzụ na ite, bụ omenala Igbo. Ihe ndị a bụ ihe jikọrọ ụmụ Igbo bụ Igbo ọnụ. Ha nwere ebe a na-amụta ihe ndị bụ ụmụ Igbo kwesiri ịna-eme na ihe a na-asọ nsọ. Ezi na ụlọ bụ ụlọ akwụkwọ anyị nọ site na akụkọ ifo, ka anyị na amụta ihe bụ omenala Igbo na ihe bụ omenaelu. Na mbara ka ọha na eze na-agbakọ were ma iwu ihe ala na-asọ nsọ, na otu a ga-esi rie onye mere ihe ala na-asọ nsọ nha. A na-ada onye merụrụ ala Igbo nha. A na-eri onye ahụ iwu, iji me ka ọ ghara ime ya ọzọ.
Igbo na-eti mmanwụ were eje iri ndị dara iwu obodo nra! Ndị na-ese okwu nwere usoro ndị okenye họpụtara ha ji emezi ya bụ okwu, na onye ukwu na onye nta ga-eme n’ude. Ndị okenye nwere ụzọ ha si ekpebi ikpe ka udo dị na-erighị ngo. Maka na o metụta imi, o metụtala ọnụ. Nwanyị na di ya na-ese okwu, ndị okenye mara onye ikpe mara, marakwa ụzọ ha ga-esi tinye okwu ahụ ọnụ ka di na nwunye ya laa be ha ga birikwa n’udo.
Ndị na-azọ ala, ndị okenye nwere osisi ogirishi e ji amata okere ala. Ha bakwa agba aka ebe onye nwe ya bụ ala, na onye na-akọ ji na-ede na yabụ ala. Ha makwa ndị ha na ha gbara obi/ ha makwa ndị ha na ha na-akpa okere ala.
Ihe ndị a na-eme ka esemụ okwu ghara ịba ka ọnya bara mmadụ na ọkpa na-anaghị ala ala. A nakwa agba ndị mmadụ iyi ma ha na-esi agụgọ na ihe ekwuru abụghị ka o siri me.
E nwekwara usoro e ji alụ di na nwayị n’omenala Igbo. Ịgba njụ, ịpa mmanya ngwụọ na ọjị, ka jụa ese nwanyị nwoke chọrọ ịlụ. E nwere ụzọ ịpa mmanya. E nwere abọ ji ole eji alụ nwanyị. E nwekwara ụzọ e si ele ọmụgwụọ ma nwanyị mụọ nwa. E nwere usoro e si aga mgba erụ. E nwere ụzọ e si amụ ọlụ aka, na afọ ole onye na-amụ ọlụ aka ga-anọ tupu e duo ya ụlọ, ka ọ gazịa zụba ahịa nke ya. E nwekwara ụzọ e si agwa onye onye ya nwụrụ okwu maka ka aghara ili ozu abụo. A na-ezipụ ndị okenye mara ihe ka ha je ya bụ ozi.
Igbo nwekwara ụzọ e si akwa ozu. Igbo nwekwara oge nwanyị na-erumkpe kwesiri irucha mkpe. Ọ dịghị ihe kọrọ akọ n’omenala Igbo. Igbo kwetara na ihe ọ ga-abụ e me gị ọ gaghị adị gị mma, ka ị gharakwa ime ya onye ọzọ.
Omenala Igbo gbagidere ụkwụ n’eziokwu, egbe bere ugo bere nke sị na ibe ya agaghị ebe ka nku kwa ya n’ike. Omenala Igbo bụ eziokwu bụ ndụ. Ụmụ Igbo bụ ụmụ Chukwu, kpọm kwem! Ị kwere na nke a?

Source: Prince Martin Uchechukwu on Facebook

0 comments:

Post a Comment